MASTER REPORTERS GLOBAL NEWS....
BBC News Ngagharị
Image copyrightTWITTER/NNAMDI KANU
Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'ihe gbasara ihe onyonyo gosiri ya na nwunye ya na-efegharị.
Kanu kwuru sị na "Ụwa niile ahụla na gị bụ nwunye m mara ezigbo mma dịka m na-ekwukarị n'elu igwe redio".
Lee ihe o kwuru n'elu Twitter ebe a:
Tupu Kanu ekwuputa okwu a, BBC Igbo kpọkuru Paul Achalla bụ ọkaiwu ndị IPOB, ebe o kwuru sị "Kanu achọghị ịtụpụ ọnụ gbasara ihe na-eme".
Achalla kwukwara sị na "Onweghi mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo na nwaanyị anaghị amasị ya."
BBC Igbo tụpụrụ okwu ya n'elu Facebook, ka ndị mmadụ tinye ọnụ.
Ụfọdụ kwuru sị na ebe ọ bụ na ọ bụ nwunye ya so ya nọrọ n'ime ya bụ ihe onyonyo, na enweghi ihe ọjọọ o mere.
Ndị ọzọ na-ajụ etu ihe onyonyo a si pụta ihe, ebe ụfọdụ na-ekwukwa na ọ bụ ndị chọrọ imegide Kanu tụpụtara ihe onyonyo ahụ n'ezi.
Lee ihe ha kwuchara ebe a:
Dịka ihe onyonyo na-egosi Nnamdi Kanu na nwunye ya na-efegharị na soshal midia ugbua, onye ọbụla na-eche ka o tinye ọnụ...
Source : BBC Igbo
Share this
Copyright © 2019 Master Reporters all rights Reserved.
0 comments: