MASTER REPORTERS GLOBAL NEWS
Bringing to you Breaking news from around the globe.
Ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Peace Chukwudi ekwuola na ihe mere mba Naịjirịa ji chọọ inwụchi onye ndu Ipob bụ makana ndị ọchịchị na-eme ihe masịrị ha n'ụzọ na-akwụghị ọtọ.
O kwukwara na ndị ọchịchị Naịjirịa kwesiri ijụ ihe mere ndị agha Naịjiria ji wakpo be Nnamdi n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.
Ụkọchukwu Peace kwuru na ha na-ele anya ka ha hụ ka ndị ọchịchị ga-esi ga nwuchie Nnamdi Kanu n'ala Israel.
Cheta na ihe mere ụlọikpe ukwu dị n'Abuja jiri nye iwu ka anwụchigharịa onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bụ maka abịaghị ụlọikpe ugboro ugboro.
Jọstịs Binta Nyako bụ onye nyere mkpebi a n'ụbọchị Tọzde.
Source: BBC IGBO
Share this
Copyright ©2019 Master Reporters All rights Reserved.
0 comments: