
Ndị uweojii Anambra steeti sị na ha enwetebeghi iwu si n'ụlọikpe sị ka a ghara inwuchi ọkaiwu Ipob bụ Ifeanyi Ejiofor.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed gwara BBC Igbo na ha amaghi ebe akụkọ na-ekwu nke a siri pụta.

Mohammed sị na ha ka na-achọ Ejiofor achọ dịka ụlọikpe si nye ha ikike ruo mgbe ụlọikpe a ga-ekwugharị.
Cheta na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uwojii na ụfọdụ ndị eche na ha bụ ndị Ipob n'ụlọ Ejiofor dị n'Oraifitte, Anambra n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba.
Nke a butere ọnwụ ndị uweojii abụọ, ịkpọ ụlọ Ejiofor nakwa ụgbọala ndị uweojii ọkụ.
Ejiofor bokwara ndị uweojii ebubo igbu ndị nkwado ya mmadụ anọ bụ nke ndị uweojii gọnarịrị.
Ụlọ ọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters derena ụlọikpe sị ka a ghara inwuchi Maazị Ejiofor.
Mbọ BBC Igbo gbara inwete Ejiofor amitaghi mkpụrụ maka ekwenti ya agaghị.
0 comments: