Agam Akwado Biafra Ma Emee Referendum - Senator Abaribe Na BBC Igbo


Enyinnaya Abaribe

Onyeisi pati na-anọghị n'ọchịchị n'ụlọomeiwu bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe ekwuola na a sị ya binye aka maka nwereonwe Biafra, na ọ ga-akwado Biafra.

Abaribe onye kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụọnụ ụlọọrụ Irokopost TV gbara ya nso nso a sị na a na-adọghachị ndị Igbo azụ.

Abaribe kwuru na onweghị ihe na-enye ọṅụ maka ụbọchị ncheta onyekwuoucheya nke afọ 2020 makana ụfọdụ jizi ya bụ atụmaatụ eme ihe sọrọ ha.

Ihe o kwuru maka mwakpo a na-ebo ndị Fulani na-abata ala Igbo

Abaribe kwuru na ya na ndịisi Ohaneze, ndị gọvanọ mere ọgbakọ gbasara okwu a.

O kwuru na e kwesiri iji otu olu wee gbo ya bụ nsogbu dịka ndị Yoruba si mee site n'iwepụta atụmatụ nchekwa a kpọrọ Amotekun ga-echekwa ala ha.

O kwuru na ha nụrụ n'oge "Lockdown" na ndị bi ugwu a kpọrọ Almajiri na-enubata n'ala Igbo.

"E nwere otu abụọ si n'Ugwu abata ala Igbo nke gunyere ndị na-enweghị ihe ha nwere ma na-achọ ịbata gbaa mbọ , ndị na-abịabu ịbịa rụọ ọrụ ugbọ, mana nke na-enye nsogbu bụ ndị na-abata ịbia gbaa ọgbatumtum, che nche makana ha si obodo ọzọ bata Naịjirịa. Ha anaghị asụ asụsụ Naịjirịa ma ncha.

"Ndị gọvanọ kwesiri inye ndị uweojii iwu ka ha kwụsị ndị a na-anbata mana etu esi hiwe ndị uweojii ugbua bụ ụdị ga-abụ na ị gaghị agwali ha ihe ha ga-eme maọbụrụ na ha anataghị ikike n'aka onyeisi ha nọ n'Abuja."

Ọ bụrụ na ndị gọvanọ ejighị aka ha wepụta ma nata ikike gbasara nchekwa ala Igbo n'aka gọọmenị etiti, e nwereike ịmachị nke ọbụla ehibere dịka e mere otu Indigenous People of Biafra (Ipob).

Ihe mere e ji ahụta ihe ọbụla ndị Igbo mere ka ọpụrụiche

N'okwu Abaribe, "Agha Biafra ebibeghị n'obi ụfọdụ nke mere na ihe ọma ọbụla a na-emere ha dịka saraka."

Ihe na-ewe ndị Igbo agbụrụ ọhụrụ a bụ na ọ na-agbagwoju ha anya ka e si nwee agbụrụ dị iche iche ma na-enyekarị otu n'ime ha oke karịa ndị ọzọ.

Ihe onye Igbo chọrọ bụ ka e me Chike ka e mere Chinwe, ka onye ọbụla sizie n'ọnatarachi ha wee bawanyezie ụba.

Oche Onyeisiala 2023?

O kwuru na ọ ga-amasị ya ịchị Naịjirịa, mana "anọ m na People's Democratic Party. Ekwesiri m ịkwado onye Igbo ọbụla si na Pati ahụ ga-achịkọta ndị Igbo ga-atụkwasi ya obi itụnyere ya inweta akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa ahụ"

Ọ sị na o kwenyere na ndị Igbo chọrọ Biafra, ndị nke chọrọ "Restructuring" nakwa ndị chọrọ ka onye Igbo chịa Naịjịrịa n'afọ 2023.

Biafra Referedum?

Abaribe kwuru na akwụkwọ iwu Naịjirịa nke a haziri n'afọ 1999 enyeghị ikike maka inweta "ntụzịaka nwereonwe" nke mere na ndị mmadụ na-ekwu ka a tufuo akwụkwọ iwu ahụ, mee ọzọ.

"A ga-enweriri ihe na-enweghịzi ka a ga-esi mee ya , ga-eme ka Naịjirịa kweta ka onye ọbụla gawara onwe ya."

Abaribe kwuru na dịka ụmụ Igbo na-achọ nwereonwe, ọ ga-adị mma ka ha were ọnatarachi ha wee wulite ala Igbo ọfụma.

O kwuru na o cheghị na steeti kwesiri ị na-agbaga Abuja kere ego, kama ha ewere ọnatarachi ha mepụta ego ha chọrọ iji wulite ala ha.

"A sị mụ binyeaka maka nwereonwe ndị Igbo, aga m ebinye aka makana a na-adọchị anyị azụ."

Abaribe gosiri nwute na ndị Igbo enwetechaghị ọnọdụ na-eme ka azụmaahịa ha gaa siriri werere n'ala Igbo nke mere na ha na-etinyekarị ego n'iro karịa n'ala Igbo.

Kedụ mgbe ikpeazụ ị nụrụ olu Nnamdi Kanu?

Abaribe kwuru na ya na Nnamdi Kanu kpara nkata ikpeazu ụbọchị fotere chi tupu awakpo bee nna ya n'Afaraukwu, n'isi obodo Abia steeti.

O kwuru na ọ nabatara Kanu na bee ya, ma gwa ya maka ihe bụ ụjọ ha nakwa ya jiri nwayọọ na-achọ ihe ọ na-achọ.

"Nke a mere na etu e si wakpoo bee Kanu gbagwojuru m anya, makana anyị ahụghị ihe gosiri na udi ihe ahụ ga-emeli.

"Ọ bụ ya kpatara na mgbe ndị DSS nwuchiri m ma na-ajụ m ebe Nnamdi Kanu nọ, m gwara ha na ọ bụ ha ka m ga na-ajụ maka ebe nwa amadi ahụ nọ."

Previous Post
Next Post

About Author

0 comments: